Job 14

1“Mmadụ nke nwanyị mụrụ
nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.
2Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya,
dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.
3Ị na-elegide onye dị otu a anya?
Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
4Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha?
Ọ dịghị onye ọ bụ.
5Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ;
ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile,
kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.
6Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya
ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.

7“Ma olileanya dịịrị osisi;
nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa,
alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
8A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala,
maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
9mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya,
ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
10Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya;
ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.
11Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata,
maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,
12otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ;
tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya,
agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.

13“A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ,
na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara.
A sị na ị ga-akanyere m oge
ma mesịa cheta m.
14Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ?
Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m,
aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.
15Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị,
agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
16Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ,
ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
17A ga-ekechi njehie m nʼakpa,
ị ga-ekpuchi mmehie m.

18“Ma dịka ugwu si erichasi daa,
na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
19dịka mmiri si akwọchasị nkume,
na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala,
otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
20Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga;
ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.
21Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a;
ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
22Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama
ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”
Copyright information for IboBIU